16 Josaia we chigharia onwe-ya, hu ílì nile nke di n'ebe ahu n'ugwu ahu; o we zìe, chipu ọkpukpu n'ílì nile, sure ha ọku n'elu ebe-ichu-àjà ahu, merua ya, dika okwu Jehova si di nke onye nke Chineke ahu kpọsara, bú onye kpọsara ihe ndia.
17 O we si, Gini bu ihe-iriba-ama ahu nke mu onwem nāhu? Ndikom obodo ahu we si ya, Ọ bu ílì onye nke Chineke, onye siri na Juda bia, kpọsa ihe ndia nke i meworo megide ebe-ichu-àjà Bet-el.
18 Ọ si, Ya nọduru onwe-ya; ka nwoke ọ bula ghara ichipu ọkpukpu-ya. Ha we rapu ọkpukpu-ya, ha na ọkpukpu onye-amuma ahu nke siri na Sameria bia.
19 Ọzọ kwa, ulo nile nke ebe nile di elu, nke di n'obodo nile nke Sameria, nke ndi-eze Israel mere ikpasu Jehova iwe, ha ka Josaia wezugara, me kwa ha dika omume nile si di nke o mere na Bet-el.
20 O b͕ue ndi-nchu-àjà nile nke ebe nile di elu nke di n'ebe ahu, n'elu ebe-ichu-àjà nile, o sure-kwa-ra ọkpukpu madu n'elu ha; o we laghachi na Jerusalem.
21 Eze we nye ndi Juda nile iwu, si, Merenu Jehova, bú Chineke-unu, ememe ngabiga, dika edeworo ya n'akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu nka.
22 N'ezie emeghi ememe ngabiga dika ememe ngabiga nka site n'ubọchi ndi-ikpe ndi kpere Israel, ọbuná ubọchi nile nke ndi-eze Israel, na nke ndi-eze Juda;