22 N'ezie emeghi ememe ngabiga dika ememe ngabiga nka site n'ubọchi ndi-ikpe ndi kpere Israel, ọbuná ubọchi nile nke ndi-eze Israel, na nke ndi-eze Juda;
23 ma ọ bu n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Josaia, ka emere ememe ngabiga nka nye Jehova nime Jerusalem.
24 Ọzọ kwa, ndi nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa, na teraphim, na arusi nile, na ihe-árú nile nke ahuru n'ala Juda, na nime Jerusalem, ndia ka Josaia tkpochapuru, ka o we me ka okwu nile nke iwu guzosie ike, bú nke edeworo n'akwukwọ nke Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara n'ulo Jehova.
25 Ọ dighi eze nke buru ya uzọ di ka ya, onye were obi-ya nile, were kwa nkpuru-obi-ya nile, were kwa ike-ya nile, chigharikute Jehova, dika iwu nke Moses si di; ọ dighi kwa onye ọzọ dika ya biliri mb͕e ọ nwusiri.
26 Otú ọ di, Jehova esighi n'idi-ọku iwe uku Ya laghachi, nke iwe-Ya ji di ọku megide Juda, n'ihi nkpasu-iwe nile nke Manase kpasuru Ya.
27 Jehova we si, M'gēsi kwa n'irum wezuga Juda, dika M'wezugara Israel, M'gāju kwa obodo a nke M'rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M'siri, Aham gādi n'ebe ahu.
28 Ma okwu Josaia nile nke fọduru, na ihe nile nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?