6 O si-kwa-ra n'ulo Jehova buputa Ashera je n'azu Jerusalem, rue miri-iyi Kidron, sure ya ọku n'akuku miri-iyi Kidron, supia ya me ka ọ di ka uzuzu, kpofue uzuzu-ya n'elu ílì ndi efu.
7 Ọ kwatu-kwa-ra ulo nile nke ndi edoro nsọ ikwa iko, nke di n'ulo Jehova, ebe ndinyom nākpara Ashera ulo-ikwū.
8 O me-kwa-ra ka ndi-nchu-àjà nile si n'obodo Juda nile bia, o meru-kwa-ra ebe nile di elu ebe ndi-nchu-àjà surere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, site na Geba rue Bia-sheba; ọ kwatu-kwa-ra ebe nile di elu nke ọnu-uzọ-ama nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama Joshua, bú onye-isi obodo, nke di n'aka-ekpe madu n'ọnu-uzọ-ama obodo.
9 Nání na ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu adighi-arigo n'ebe-ichu-àjà Jehova nime Jerusalem, ma ha nēri achicha ekoghi-eko n'etiti umu-nne-ha.
10 O meru-kwa-ra Tofet, nke di na ndagwurugwu umu Hinom, ka nwoke ọ bula we ghara ime ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku rue Molek.
11 O me-kwa-ra ka inyinya nile kwusi, bú nke ndi-eze Juda nyere anyanwu, nime nbata ulo Jehova, n'akuku ime-ulo Netan-melek, bú onozi, nke di n'èzí ulo ahu; o sure-kwa-ra ub͕ọ-ala nile nke anyanwu n'ọku.
12 Ebe-ichu-àjà nile nke di n'elu ime-ulo-elu nke Ehaz, nke ndi-eze Juda mere, na ebe-ichu-àjà nile nke Manase mere n'ogige abua nke ulo Jehova, eze kwaturu ha, we si n'ebe ahu b͕a ọsọ, kpofue uzuzu-ha nime miri-iyi Kidron.