15 O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.
16 Ndikom nile kwa ndi bu dìnkpà, nnù iri-na-asa na ọgu iri, na ndi-ọ̀kà na ndi-uzú, nnù abua na ọgu iri, ha nile bu ndi-dike, ndi nēbu agha, eze Babilon we me ka ha bia Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.
17 Eze Babilon we me Matanaia nwa-nne nna-ya eze n'ọnọdu ya, gughari kwa ya aha Zedekaia.
18 Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.
19 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoaiakim mere.
20 N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.