4 ọzọ kwa, n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n'ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.
5 Ma okwu Jehoiakim nile fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
6 Jehoiakim we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
7 Ma eze Ijipt esighi n'ala-ya puta ọzọ ma-ọli: n'ihi na eze Babilon ewerewo ihe nile eze Ijipt nwere site na miri-iyi Ijipt rue osimiri Yufretis.
8 Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze nime Jerusalem ọnwa atọ: aha nne-ya bu Nehushta nwa Elnetan nke Jerusalem.
9 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.
10 Na mb͕e ahu ka ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoruru Jerusalem, ewe nọchigide obodo ahu n'agha.