8 Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze nime Jerusalem ọnwa atọ: aha nne-ya bu Nehushta nwa Elnetan nke Jerusalem.
9 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.
10 Na mb͕e ahu ka ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoruru Jerusalem, ewe nọchigide obodo ahu n'agha.
11 Nebukadneza, bú eze Babilon, we biarue obodo ahu, mb͕e ndi-orù-ya nānọchigide ya n'agha;
12 Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze.
13 O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri.
14 O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n'ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu.