12 Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.
13 Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.
14 Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.
15 Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.
16 Ogidi abua ahu, otù oké osimiri ahu, na ihe-ndọkwasi nile, nke Solomon mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.
17 Cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di, isi nke di n'elu ya bu kwa ọla: idi-elu isi ahu di cubit atọ; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n'isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na ihe-ọkpukpa.
18 Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ: