21 Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Eze we me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.
22 Ma ndi fọduru n'ala Juda, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha fọdu, o we me Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka ọ buru onye-nlekọta-ha.
23 Ndi-isi nile nke usu-ndi-agha nile, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia onye-nlekọta, ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan nwa Karca, na Seraia nwa Tanhumet onye Netofa, na Jaazanaia nwa onye Meakat, ha onwe-ha na ndikom-ha.
24 Gedalaia we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si ha, Unu atula egwu n'ihi ndi-orù ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon òfùfè, ọ gādi-kwa-ra unu nma.
25 O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, biara, ya na ndikom iri, ha we tib͕ue Gedalaia, o we nwua, ha tib͕u-kwa-ra ndi-Ju na ndi Kaldea ndi ya na ha nọ na Mizpa.
26 Ndi-Ju nile, site n'onye ntà we rue onye uku, na ndi-isi usu-ndi-agha nile, we bilie, biarue Ijipt: n'ihi na ha turu egwu ndi Kaldea.
27 O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o siri n'ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda;