10 Biko, ka ayi me ime-ulo-elu ntà nke mb͕idi; ka ayi dọba-kwa-ra ya n'ebe ahu ihe-ndina, na table, na oche, na ihe-idọba-oriọna: o gēru kwa, mb͕e ọ biakutere ayi, na ọ gēwezuga onwe-ya ba n'ebe ahu.
11 Ubọchi we rue, na ọ biara n'ebe ahu, wezuga onwe-ya ba n'ime-ulo-elu ahu, dina n'ebe ahu.
12 Ọ si Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Kpọ nwayi Shunem nka. O we kpọ ya, o we guzo n'iru ya.
13 Elaisha we si Gihezi, Biko, si ya, Le, i werewo ncheb͕u a nile cheb͕u onwe-gi bayere ayi; gini ka agēmere gi? ọ̀ bu igwa eze okwu bayere gi, ma-ọbu igwa onye-isi usu-ndi-agha? Ọ si, N'etiti ndim ka mu onwem nēbi.
14 Ọ si, Gini kwa ka agēmere ya? Gihezi we si, N'ezie ọ nweghi nwa-nwoke, di-ya aghọwo kwa agadi.
15 Ọ si, Kpọ ya. O we kpọ ya, nwayi ahu we guzo n'ọnu-uzọ.
16 Ọ si, Na mb͕e nka akara àkà, dika mb͕e a aka-nile, gi onwe-gi ganāb͕aku nwa-nwoke. Ọ si, É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha.