18 Nwata ahu we toputa, ubọchi we rue, na ọ pukuru nna-ya jekuru ndi nēbì ọka.
19 Ọ si nna-ya, Isim, isim. O we si nwa-okorọbia-ya, Kuru ya bakuru nne-ya.
20 O kuru ya, me ka ọ biakute nne-ya, ọ nọkwasi n'ikperè nne-ya rue etiti-ehihie, we nwua.
21 Ọ rigo, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina onye nke Chineke ahu, mechibido ya uzọ, pua.
22 Ọ kpọ di-ya, si, Biko, ziterem otù nime umu-okorọbia, na otù nime nne-inyinya-ibu, ka m'we b͕akuru onye nke Chineke, lata kwa.
23 Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo.
24 O we jikwa inyinya-ibu, si nwa-okorọbia-ya, Nēdu, nēje kwa; eb͕ochilaram inyinya-ibu n'ibum b͕a ọsọ, ma ọ buru na asighm i.