14 Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile;Akpakọwo ha n'otù, ha arigotawo n'olum; O mewo ka ikem su ngọngọ:Onye-nwe-ayi enyewom n'aka-ha, bú ndi m'nāpughi iguzosi ike megide.
15 Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n'etitim:Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam:Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke.
16 N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri;N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ;Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike.
17 Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere;Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya:Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n'etiti ha.
18 Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide:Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um:Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha.
19 Akpọkurum ndi nāhum n'anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum:Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n'obodom,Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha.
20 Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku;Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku:N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.