Abù-Ákwá 4 IGBOB

1 Le, ka ọla-edo si echu echu nke-uku! le, ka ọla-edo nke makarisiri nma si ab͕anwe!Anāwusi nkume nile nke ebe nsọ n'isi èzí nile ọ bula.

2 Umu Zaion nke di oké ọnu-ahia, ndi eji turu ọla-edo anuchara anucha,Le otú aguworo ha n'ite urọ, bú ọlu aka ọkpu-ite!

3 Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara:Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n'ọzara.

4 Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n'okpo-ọnu-ya site n'akpiri-ikpọ-nku:Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha.

5 Ndi nēri nání ihe utọ di iche iche tọb͕ọrọ n'efu n'èzí nile:Ndi azùputaworo n'uwe uhie amakuwo ebe-ikpofu-ahihia.

6 Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm,Nke akwaturu dika n'otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.

7 Ndi-Nazirait-ya di ọcha kari snow, ha nwuru enwu kari miri-ara-ehi,Ha chara ọbara-ọbara n'aru kari ruby, dika sapphire ka udi-ha di.

8 Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n'èzí:Akpukpọ-ha araparawo n'ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi.

9 Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo;N'ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.

10 Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite;Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.

11 Jehova emezuwo ọmuma-Ya, Ọ wupuwo iwe-Ya di ọku;O we suye ọku nime Zaion, o we ripia ntọ-ala-ya nile.

12 Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n'elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa,Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.

13 O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya,Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n'etiti ya.

14 Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.

15 Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.

16 Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ:Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.

17 Anya-ayi nādala n'isi rue ub͕u a n'ile anya iye-aka efu ayi:N'iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.

18 Ha achuwo ntá nzọ-ukwu nile ayi, ayi we ghara ijeghari n'amá nile ayi;Ọgwugwu-ayi di nso, ubọchi nile ayi eruzuwo; n'ihi na ọgwugwu-ayi abiawo.

19 Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe:N'elu ugwu nile ka ha churu ayi n'ọku ọku, n'ọzara ka ha chere ayi anwu.

20 Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n'olùlù-ha;Onye ayi siri, N'okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n'etiti mba nile.

21 Ka obi nātọ gi utọ, ṅuria ọṅu, gi ada Edom, nke bi n'ala Uz:Ọbuná gi ka iko gāgabigaru: i gāṅubiga manya ókè, b͕aba onwe-gi ọtọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5