12 Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú.
13 O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua.
14 Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile.
15 O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ.
16 O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.
17 I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma.
18 M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.