14 Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile.
15 O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ.
16 O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.
17 I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma.
18 M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.
19 Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.
20 Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem.