19 Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.
20 Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem.
21 Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere.
22 O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.
23 Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.
24 Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.
25 Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.