22 O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.
23 Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.
24 Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.
25 Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.
26 Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.
27 Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.
28 Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya.