24 Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.
25 Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.
26 Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.
27 Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.
28 Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya.
29 Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi.
30 Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.