34 Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu,
35 Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu,
36 Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma.
37 Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?
38 Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?
39 Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?
40 Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.