38 Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?
39 Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?
40 Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.
41 Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua.
42 Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.
43 I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.
44 I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.