43 I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.
44 I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.
45 Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche.
46 Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.
47 Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia.
48 Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.
49 Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,