46 Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.
47 Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia.
48 Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.
49 Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,
50 Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.
51 Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.
52 Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.