56 Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum.
57 I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.
58 Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.
59 Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem.
60 I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum.
61 I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;
62 Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile.