7 Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu;Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.
8 Ndi-orù achiwo ayi:Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.
9 Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayiN'ihi mma-agha nke ọzara.
10 Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku ukuSite n'ifufe di ọku nke oké ugwu.
11 Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala,Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda.
12 Ekobere ndi-isi n'aka-ha:Asọpughi iru ndi-okenye.
13 Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri,Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.