9 Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayiN'ihi mma-agha nke ọzara.
10 Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku ukuSite n'ifufe di ọku nke oké ugwu.
11 Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala,Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda.
12 Ekobere ndi-isi n'aka-ha:Asọpughi iru ndi-okenye.
13 Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri,Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.
14 Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama,Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.
15 Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo;Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.