2 O rue, mb͕e eze huru Esta, bú nwunye eze, ka o nēguzo n'ogige, na ọ natara amara n'anya-ya: eze we setipuru Esta nkpa-n'aka ọla-edo nke di n'aka-ya. Esta we biarue nso, metu isi nkpa-n'aka ahu.
3 Eze we si ya, Gini ka i nāchọ, Esta, nwunye eze? gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēnye kwa gi.
4 Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka eze na Heman bia ta n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nke m'meworo ya.
5 Eze we si, Menu ka Heman me ngwa ime ihe Esta kwuru. Eze na Heman we bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.
6 Eze we si Esta n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme ya.
7 Esta we za, si, Aririọm na ọchichọm bu;
8 ọ buru na ahutawom amara n'iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m'nāriọ, na ime ihe m'nāchọ, ka eze na Heman bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke m'gēmere ha, echi ka m'gēme kwa dika okwu eze si di.