Ezra 3:2-8 IGBOB

2 Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, dika edeworo ya n'iwu Moses, bú onye nke Chineke.

3 Ha we me ka ebe-ichu-àjà guzosie ike n'ebe-ndọkwasi-ya nile; nihi na oké ujọ di n'aru ha n'ihi ndi ala ahu nile: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, bú àjà-nsure-ọku anēsure ututu na anyasi.

4 Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n'ubọchi-ha n'ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya;

5 mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo.

6 Site n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa ka ha malitere isurere Jehova àjà-nsure-ọku: ma akātọghi ntọ-ala ulo uku Jehova.

7 Ha nye kwa ndi nāwa nkume, nye kwa ndi-ọ̀kà n'osisi, ego; ha nye kwa ndi Zaidon, nye kwa ndi Taia, ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na manu, ka ha we si na Lebanon bute osisi cedar rue oké osimiri, rue Jafo, dika nkwenye nke Sairọs, bú eze Peasia, kweyere ha.

8 Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova.