Ezra 5 IGBOB

1 Ma ndi-amuma, bú Hagai onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido, buru amuma nye ndi-Ju ndi nọ na Juda na nime Jerusalem; ọ bu n'aha Chineke Israel ka ha buru amuma nye ha.

2 Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume.

3 Na mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, biakutere ha, we si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, na iluzu mb͕idi a?

4 Mb͕e ahu otú a ka ayi siri ha. Ha siri, Òle aha ndi nēwu ulo a anēwu?

5 Ma anya Chineke-ha di n'aru ndi-okenye ndi-Ju, ha we ghara ime ka ha kwusi, rue mb͕e okwu ahu jeruru Daraiọs nti: mb͕e ahu ha we zighachi akwukwọ-ozi bayere ihe a.

6 Ndeputa akwukwọ-ozi nke Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ya, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, zigara Daraiọs, bú eze.

7 Ha zigara ya akwukwọ, otú a ka ede-kwa-ra nime ya; Daraiọs, bú eze, nwe akwukwọ a, udo nile diri ya.

8 Ka eze mara, na ayi jere n'ala anāchi achi, bú Juda, rue ulo Chineke uku, ma anēwere nkume nkpọrè wue ya, anēdo kwa osisi nime mb͕idi, anālu kwa ọlu a ọsọsọ, ọ nāga kwa nke-ọma n'aka-ha.

9 Mb͕e ahu ayi juru ndi-okenye ahu, si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, iluzu mb͕idi a?

10 Ọzọ kwa, ayi juru ha aha-ha, ime ka i mara, ka ayi we de aha ndikom ahu ndi bu isi-ha n'akwukwọ.

11 Ma otú a ka ha zaghachiri ayi okwu, si, Ayi onwe-ayi bu ndi-orù nke Chineke nke elu-igwe na uwa, ayi nēwu kwa ulo nke ewuru ọtutu arọ gara aga site na mb͕e a, nke otù eze uku nke Israel nwere wuru, wuzu kwa.

12 Ma mb͕e nna-ayi-hà kpasusiri Chineke nke elu-igwe iwe, O nyere ha n'aka Nebukadneza, bú eze Babilon, onye Kaldea, o we me ka ulo a la n'iyì, o me-kwa-ra ka ndi-ayi je biri na Babilon.

13 Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Babilon, Sairọs, bú eze, nyere iwu iwu ulo Chineke a.

14 Ọzọ kwa, ihe nile nke ulo Chineke, nke ọla-edo na nke ọla-ọcha, nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke di na Jerusalem, chibata ha n'ulo uku nke Babilon, ihe ahu ka Sairọs, bú eze, chiputara n'ulo uku Babilon, nye ha n'aka otù onye, Sheshbaza bu aha-ya, onye o mere onye nāchi ala;

15 ọ si ya, Chiri ihe ndia, je, dọba ha n'ulo uku Chineke ahu nke di na Jerusalem, ka ewu kwa ulo Chineke n'ọnọdu-ya.

16 Mb͕e ahu Sheshbaza ahu biara, tọ ntọ-ala nile nke ulo Chineke nke di na Jerusalem: ma site na mb͕e ahu we rue ub͕u a ka anēwu ya, ma ewuzughi ya.

17 Ma ub͕u a, ọ buru na ọ di eze nma, ka achọ n'ulo àkù eze, nke di n'ebe ahu nime Babilon, ma ọ bu ezie na esitere n'aka Sairọs, bú eze, nye iwu iwu ulo a nke Chineke nime Jerusalem, ka eze zite-kwa-ra ayi ihe nātọ ya utọ bayere okwu a.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10