2 ha we biarue Zerubabel nso, biaru kwa ndi-isi ulo nke ndi bu nna nso, si ha, Ka ayi so unu wue ulo: n'ihi na ayi nāchọ Chineke-unu, dika unu si achọ; ma ayi onwe-ayi adighi-achu àjà site n'ubọchi Isa-hadon, bú eze Asiria, onye mere ka ayi rigorue ebe a.
3 Zerubabel na Jeshua na ndi fọduru nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel we si ha, Ọ dighi nke ayi na unu nwekọrọ n'iwuru Chineke-ayi ulo; kama ayi onwe-ayi gēwukwara Jehova, bú Chineke Israel, ulo, dika eze, bú Sairọs eze Peasia, nyere ayi iwu.
4 O rue na ndi ala ahu nēme ka aka ndi Juda ghara idi ike, ha nēme kwa ka ha tua egwu n'iwu ulo,
5 ha nēgota kwa ndi nādu ọdu megide ha, imebi idu-ọdu-ha, ubọchi nile nke Sairọs, bú eze Peasia, ọbuná rue ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.
6 Ma n'ọbubu-eze Ahasuerọs, na nmalite ọbubu-eze-ya, ha dere akwukwọ-nmegide imegide ndi bi na Juda na Jerusalem.
7 N'ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n'asusu Siria, asughariwo kwa ya n'asusu Siria.
8 Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, degara Ataksakses, bú eze, akwukwọ-ozi imegide Jerusalem otú a: