1 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, n'ọbubu-eze nke Ataksakses, bú eze Peasia, Ezra nwa Seraia, nwa Azaraia, nwa Hilkaia,
2 nwa Shalum, nwa Zedok, nwa Ahaitub,
3 nwa Amaraia, nwa Azaraia, nwa Meraiot,
4 nwa Zerahia, nwa Uzi, nwa Buki,
5 nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà:
6 Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.