11 Ma nka bu ndeputa akwukwọ-ozi ahu nke eze, bú Ataksakses, nyere Ezra, bú onye-nchu-aja, bú ode-akwukwọ, ọbuná ode-akwukwọ nke okwu nile nke ihe nile Jehova nyere n'iwu, na nke ukpuru-Ya nile O nyere Israel.
12 Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a.
13 Esitewo n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo ije Jerusalem nime ndi Israel, na ndi-nchu-àjà-ha na ndi Livai, n'ala-ezem, ya so gi je.
14 N'ihi na anēsi n'iru eze na madu asa ndi nādu ya ọdu ziga gi iwere iwu Chineke-gi nke di n'aka-gi ju ajuju bayere Juda, baye-kwa-ra Jerusalem;
15 na ibūru ọla-ọcha na ọla-edo nke eze na ndi nādu ya ọdu were afọ-ofufo nye Chineke Israel, Onye ebe-obibi-Ya di na Jerusalem,
16 na ọla-ọcha na ọla-edo nile nke i gāchọta n'ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, tiyere onyinye-afọ-ofufo nke ndi-gi, na nke ndi-nchu-àjà-ha, ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha bayere ulo Chineke-ha nke di na Jerusalem;
17 n'ihi nka i gēme ngwa were ego a zuru oke-ehi na ebulu na umu-aturu, na onyinye-inata-iru-ọma-ha na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, i gēweta ha nso ebe-ichu-àjà nke ulo Chineke-unu nke di na Jerusalem.