15 na ibūru ọla-ọcha na ọla-edo nke eze na ndi nādu ya ọdu were afọ-ofufo nye Chineke Israel, Onye ebe-obibi-Ya di na Jerusalem,
16 na ọla-ọcha na ọla-edo nile nke i gāchọta n'ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, tiyere onyinye-afọ-ofufo nke ndi-gi, na nke ndi-nchu-àjà-ha, ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha bayere ulo Chineke-ha nke di na Jerusalem;
17 n'ihi nka i gēme ngwa were ego a zuru oke-ehi na ebulu na umu-aturu, na onyinye-inata-iru-ọma-ha na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, i gēweta ha nso ebe-ichu-àjà nke ulo Chineke-unu nke di na Jerusalem.
18 Ma ihe ọ bula nke gādi gi nma, di kwa umu-nne-gi nma, iwere nke fọduru nime ọla-ọcha na ọla-edo ahu me, dika ọchichọ Chineke-unu si di ka unu gēme.
19 Ihe nile kwa nke anēnye gi iji fè òfùfè nke ulo Chineke-gi, gi me ha ka ha zue okè n'iru Chineke Jerusalem.
20 Ma nke fọduru n'ihe nile di nkpà nke ulo Chineke-gi, nke gādabayere gi inye, si n'ulo àkù eze nye ya.
21 Anēsite kwa n'akam, bú mu onwem, Ataksakses, bú eze, nye ndi-odozi-àkù nile ndi nọ n'ofè osimiri iwu, na ihe ọ bula Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, gāriọ unu, ka eme ya ngwa ngwa,