5 Site n'umu Shekania, nwa Jahaziel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri-na-ise.
6 Site kwa n'umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri.
7 Site kwa n'umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri.
8 Site kwa n'umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ.
9 Site n'umu Joab, Obadaia nwa Jehiel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri na iri na asatọ.
10 Site kwa n'umu Shelomit, nwa Josifia; ndi soro ya di ọgu ndikom asatọ.
11 Site kwa n'umu Bebai, Zekaraia nwa Bebai; ndi soro ya di orú ndikom na asatọ.