1 Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.
2 O kesawo obi-ha; ub͕u a ka ikpe gāma ha: Ya onwe-ya gētipia ebe-ichu-àjà nile ha, bibie ogidi nile ha.
3 N'ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n'ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi?
4 Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi.
5 Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ.
6 Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.
7 Emewo ka Sameria la n'iyì, ya na eze-ya, dika irighiri-osisi n'elu miri.