7 N'ihi na ifufe ka ha nāgha dika nkpuru-ọghigha, ọ bu kwa oké ifufe ka ha gēwe dika ihe-ubi: ọ dighi ọka guzoro eguzo o nwere; ihe-opupú agaghi-eme utu ọka; ọ buru na o me ma eleghi anya, ndi ala ọzọ gēloda ya.
8 Elodawo Israel: ub͕u a ha aghọwo ihe dika ihe nādighi-atọ utọ n'etiti mba nile.
9 N'ihi na ha onwe-ha arigowo n'Asiria, dika inyinya-ibu-ọhia nke nání ya nọ iche: Efraim egowo ndi nāhu ya nānya.
10 E, mb͕e ha gēgo ha n'etiti mba nile, ub͕u a ka M'gāchikọta ha; ọ gēwuta kwa ha nwa mb͕e ntà site n'ibu eze ndi-isi gēbo ha.
11 N'ihi na Efraim emewo ka ebe-ichu-àjà ba uba imehie, ya bu na ebe-ichu-àjà nile aghọworo ya nmehie.
12 Anamedere ya orú nnù ihe na nnù ise nke iwum, ma dika ihe ala ọzọ ka aguworo ha.
13 Àjà nile nke onyinyem nile, ha nāchu anu nàjà, we rie ya; ihe-ha adighi-atọ Jehova utọ: ub͕u a ka Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha; ha onwe-ha gālaghachi n'Ijipt.