1 Aṅurila, Israel, rue otite-egwú-ọṅù, dika ndi nile di iche iche; n'ihi na i puwo n'aka Chineke-gi kwaba iko, i huwo onyinye n'anya n'ebe-nzọcha-ọka nile.
2 Ebe-nzọcha-ọka na ebe-nzọcha-nkpuru-vine agaghi-azù ha, manya-vine ọhu gēbilata-kwa-ra ya.
3 Ha agaghi-ebi n'ala Jehova; ma Efraim gālaghachi n'Ijipt, ọ bu kwa n'Asiria ka ha gēri ihe ruru árú.
4 Ha agaghi-awusiri Jehova àjà manya-vine, àjà di iche iche ha agaghi-atọ kwa Ya utọ: dika nri ndi nēru újú ka nri-ha gādiri ha; ndi nile ndi nēri ya gāghọ ndi ruru árú: n'ihi na nri-ha gādiri ọchichọ nkpuru-obi-ha; ọ gaghi-abata n'ulo Jehova.