3 Ha agaghi-ebi n'ala Jehova; ma Efraim gālaghachi n'Ijipt, ọ bu kwa n'Asiria ka ha gēri ihe ruru árú.
4 Ha agaghi-awusiri Jehova àjà manya-vine, àjà di iche iche ha agaghi-atọ kwa Ya utọ: dika nri ndi nēru újú ka nri-ha gādiri ha; ndi nile ndi nēri ya gāghọ ndi ruru árú: n'ihi na nri-ha gādiri ọchichọ nkpuru-obi-ha; ọ gaghi-abata n'ulo Jehova.
5 Gini ka unu gēme n'ubọchi nke mb͕e ákàrà, na n'ubọchi ememe Jehova?
6 N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.
7 Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n'ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.
8 Onye-nche ka Efraim bu n'aka Chinekem: ma onye-amuma, ib͕udu nke osi-ọnyà di n'uzọ-ya nile, ikpọ-asì di kwa n'ulo Chineke-ya.
9 Ha abamiwo n'ibibi onwe-ha, dika n'ubọchi nke Gibea: Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha.