19 Otú a ka Jehova sirim: Je, guzo n'ọnu-uzọ-ama nke umu ndim, nke ndi-eze Juda nēsi abata, nke ha nēsi apu kwa, guzo kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;
20 si ha, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na Juda nile na ndi nile bi na Jerusalem, bú ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia:
21 otú a ka Jehova siri: Lezienu onwe-unu anya, unu ebu-kwa-la ibu n'ubọchi-izu-ike, unu ebubà-kwa-la ya n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;
22 unu agaghi-ebupu kwa ibu n'ulo-unu n'ubọchi-izu-ike, ọ bu kwa ozi ọ bula ka unu nāgaghi-eje: ma donu ubọchi-izu-ike nsọ, dika M'nyere nna-unu-hà iwu;
23 ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike, ka ha we ghara inu, ghara kwa inara idọ-aka-na-nti.
24 O gēru kwa, ọ buru na unu egem nti nke-ọma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ighara ibubata ibu n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a n'ubọchi-izu-ike, kama ya ido ubọchi-izu-ike nsọ, ighara ije ozi ọ bula nime ya;
25 ndi-eze na ndi-isi, ndi nānọkwasi n'oche-eze Devid, gābata kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a, bú ndi nānọkwasi n'ub͕ọ-ala na n'inyinya, ha onwe-ha, na ndi-isi-ha, ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem: obodo a gānọgide kwa rue mb͕e ebighi-ebi.