14 Israel, ọ̀ bu orù? ọ̀ bu orù amuru n'ulo ka ọ bu? gini mere o ji ghọ ihe-nluta-n'agha?
15 Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.
16 Ọzọ, umu Nof na Tahpanhes nērichapu opu-n'isi-gi.
17 Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n'irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n'uzọ?
18 Ma ub͕u a gini ka i nwere n'uzọ Ijipt, n'iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n'uzọ Asiria, n'iṅu miri nke Osimiri ahu?
19 Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
20 N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M'b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M'gaghi-efè òfùfè; n'ihi na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu nan'okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko.