Jeremaia 20:4-10 IGBOB

4 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje ime gi ka i ghọrọ onwe-gi, ghọ-kwa-ra ndi nile nāhu gi n'anya, ihe-ujọ: ha gāda kwa site na mma-agha ndi-iro-ha, anya-gi abua ganāhu kwa ya: ọ bu kwa Juda nile ka M'gēnye n'aka eze Babilon, ọ gēme kwa ka ha je biri na Babilon, ọ gēji kwa mma-agha tib͕ue ha.

5 M'gēnye kwa ihe nile akpakọbara n'obodo a, na ihe nile putara na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ihe-ya nile nke di oké ọnu-ahia, e, àkù nile nke ndi-eze Juda ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, ndi gāluta ihe-ha n'agha, chiri ha, chibà ha na Babilon.

6 Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha.

7 I ràwom urà, Jehova, ewe ràram: I jidewom, we nwe ike karim: aghọwom ihe-ichì-ọchì ogologo ubọchi nile, madu nile ọ bula nākwam emò.

8 N'ihi na mb͕e ọ bula m'nēkwu, etim nkpu; Ihe-ike na Ipunara-madu-ihe, ka m'nākpọ nkpu: n'ihi na okwu Jehova ghọrọm ihe-ita-uta na ihe-ikwa-emò ogologo ubọchi nile.

9 M'we si, M'gaghi-ehota Ya, m'gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n'aha-Ya. O we di n'obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n'ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike.

10 N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n'udo, ndi nēche nche n'akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n'aru ya.