32 Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n'okwu-ugha nile ha na n'obi-ha nādighi n'otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n'onu Jehova puta.
33 Ma mb͕e ndi nka, ma-ọbu onye-amuma, ma-ọbu onye-nchu-àjà, gāju gi, si, Gini bu ibu Jehova nēbo? I gasi kwa ha, Gini bu ibu? ọ bu na arapuwom unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
34 Ma onye-amuma ahu, ma-ọbu onye-nchu-àjà ahu, ma-ọbu ndi ahu, nke gāsi, Le, ibu Jehova nēbo: M'gēwere kwa nmehie-ya leta nwoke ahu, leta kwa ulo-ya.
35 Otú a ka unu gāsirita ibe-unu n'otù n'otù, sirita kwa nwa-nne-unu n'otù n'otù, Gini ka Jehova zaworo? na, Gini ka Jehova kwuworo?
36 Ma ibu Jehova ka unu nāgaghi-ehota kwa ọzọ: n'ihi na ibu eboro onye ọ bula bu okwu nke aka ya; unu ab͕anwewo kwa okwu nile nke Chineke di ndu, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ayi.
37 Otú a ka i gāsi onye-amuma, Gini ka Jehova zaworo gi? na, Gini ka Jehova kwuworo?
38 Ma ọ buru na unu asi, Le, ibu Jehova nēbo; n'ihi nka ka Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu a, si, Le, ibu Jehova nēbo, ma eziteworom unu ozi, si, Unu asila, Le, ibu Jehova nēbo;