1 Okwu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi Juda nile n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda; nke ahu bu arọ mbu nke Nebukadreza, bú eze Babilon;
2 bú okwu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara ndi Juda nile, gwa ndi nile bi na Jerusalem, si:
3 Site n'arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m'we gwa unu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu anughi.
4 Jehova ezitewo-kwa-ra unu ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha; ma unu anughi, unu atọghi kwa nti-unu n'ala inu;