11 Ala nka nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe na ihe-iju-anya; mba ǹdia gēfè kwa eze Babilon ọgu arọ na iri.
12 O gēru kwa, mb͕e ọgu arọ na iri ruzuru, na M'gēwere ajọ omume ha leta eze Babilon, leta kwa mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), leta kwa ala Kaldea; M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi.
13 M'gēme kwa ka okwum nile biakwasi ala ahu, bú okwu nke M'kwuworo megide ya, bú amuma nile edeworo n'akwukwọ a, nke Jeremaia buworo megide mba nile.
14 N'ihi na ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ha fè ha òfùfè, ọbuná ha onwe-ha: M'gākwughachi kwa dika omume nile ha si di, na dika ọlu nke aka-ha si di.
15 N'ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n'akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru.
16 Ha gāṅu kwa, we ṅaghari, wi ara, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti ha.
17 M'we nara iko ahu n'aka Jehova, me ka mba nile ṅua, bú ndi Jehova zigaram jekuru: