5 Ọ̀ gēchebe iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi? Ọ̀ gēdebe ya rue ọgwugwu ihe nile? Le, i kwuwo otú a, i we me ihe ọjọ gi nile, we nwe ike.
6 Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu.
7 M'we si, mb͕e ọ mesiri ihe ndia nile, Ya laghachikutem; ma ọ laghachigh: nwa-nne-ya nke nāghọb͕u, bú Juda, we hu ya.
8 M'we hu na, mb͕e M'chupusiri Israel, nye ya akwukwọ nkewa-ya n'ihi ihe ndia nile, bú na Israel nke nādaghachi azu kwarari iko, na nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u aghọb͕u, Juda atughi egwu; ọ we je kwa iko, ọbuná ya onwe-ya.
9 O rue, site n'idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko.
10 Ma ọbuná n'ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
11 Jehova we sim, Israel nke nādaghachi azu egosiwo onwe-ya onye ezi omume kari Juda nke nāghọb͕u aghọb͕u.