23 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n'ala Juda, na n'obodo-ya nile, mb͕e m'gēme ka ndi-ya adọtara n.agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ.
24 Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n'otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije.
25 N'ihi na emewom ka afọ jubiga nkpuru-obi nāda #mbà ókè, ọ bu kwa nkpuru-obi ọ bula nke nēru újú ka M'juworo.
26 Mb͕e nka gasiri m'we teta, we hu; uram we tọm utọ.
27 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gagha nkpuru madu na nkpuru anumanu n'ulo Israel na n'ulo Juda.
28 Ọ gēru kwa na, dika M'muworo anya n'aru ha iropu na ikwada, na itikpọ na ime ka ala n'iyì, na imejọ; otú a ka M'gāmu anya n'aru ha iwu ulo na iku ihe n'ubi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
29 N'ubọchi ahu ha agaghi-asi kwa ọzọ, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì.