Jeremaia 31:7-13 IGBOB

7 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Werenu ọṅù tiere Jekob nkpu ọṅù, tisi-kwa-nu nkpu ike n'isi mba nile: menu ka anuru ya, tonu, si-kwa-nu, Jehova, zọputa ndi-Gi, bú Israel fọduru.

8 Le, M'gaje ime ka ha si n'ala Ugwu bia, M'gāchikọputa kwa ha na nsọtu nile nke uwa, n'etiti ha ka onye-ìsì na onye-ngwurọ na nwanyi di ime na nwanyi ime nēme gānọ n'otù: na nkpọkọta uku ka ha gālata n'ebe a.

9 N'ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n'aririọ-amara nile ka M'gēduru ha: M'gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n'uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n'ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.

10 Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n'agwe-etiti nile di n'ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.

11 N'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n'aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya.

12 Ha gābia kwa, tie nkpu ọṅù n'ebe di elu nke Zaion, rùba dika osimiri rue ezi ihe Jehova, rue ọka, ru kwa manya-vine, ru kwa manu, ru kwa umu ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi: nkpuru-obi-ha gādi kwa ka ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma; ha agaghi-eru kwa újú ọzọ ma-ọli.

13 Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n'otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n'otù: n'ihi na M'gāb͕anwe oruru-újú-ha n'obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.