1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova n'arọ nke-iri nke Zedekaia, bú eze Juda, nke bu arọ nke-iri-na-asatọ nke Nbukadreza.
2 Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n'agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, nke di n'ulo eze Juda.
3 N'ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;
4 ma Zedekaia, bú eze Juda, agaghi-ewepuga onwe-ya n'aka ndi Kaldea, kama aghaghi inye ya n'aka eze Babilon, ha gēkwurita kwa ọnu na ọnu, anya-ya gāhu kwa anya-ya:
5 ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M'gēleta ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma?
6 Jeremaia we si, Okwu Jehova rurum nti, si,
7 Le, Hanamel nwa Shalum, bú nwa-nne nna-gi, gābiakute gi, si, Zutara onwe-gi ubim nke di n'Anatot: n'ihi na gi ka nb͕aputa ruru izuru ya.