12 na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n'ebe ahu, n'etiti ndi Israel.
13 O rue, mb͕e ọ nọ n'ọnu-uzọ-ama Benjamin, na otù onye-nwe nlekọta nọ n'ebe ahu, onye aha-ya bu Iraija nwa Shelemaia, nwa Hananaia; o we jide Jeremaia, bú onye-amuma, si, Ndi Kaldea ka gi onwe-gi nādakuru.
14 Jeremaia we si, Ọ bu okwu-ugha; adighm-adakuru ndi Kaldea; ma o geghi ya nti: Iraija we jide Jeremaia, me ka ọ biakute ndi-isi.
15 Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n'ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ.
16 Mb͕e Jeremaia batara n'ulo olùlù, na n'ime-ulo ntà ya, Jeremaia we nọdu n'ebe ahu ọtutu ubọchi;
17 eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.
18 Jeremaia we si eze, bú Zedekaia, Gini ka m'mehieworo megide gi, ma-ọbu megide ndi-orù-gi, ma-ọbu megide ndi nka, na unu tiyeworo mu onwem n'ulo-nkpọrọ?