2 Ma ọ geghi nti, ya onwe-ya, ma ndi-orù-ya, ma ndi ala ahu, n'okwu nile nke Jehova, nke O kwuru site n'aka Jeremaia, bú onye-amuma.
3 Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.
4 Ma Jeremaia nābata nāpu kwa n'etiti ndi Israel: n'ihi na ha etiyeghi ya n'ulo-nkpọrọ.
5 Ọzọ, usu-ndi-agha Fero esiwo n'Ijipt puta: ndi Kaldea ndi nānọchigide Jerusalem n'agha we nuru akukọ-ha, ha we si n'imegide Jerusalem rigo.
6 Okwu Jehova we rue Jeremaia, bú onye-amuma, nti, si,
7 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi eze Juda, onye zìworo unu biakutem ijum ase; Le, usu-ndi-agha Fero, nke putaworo iyere unu aka, gālaghachi n'ala-ya, bú Ijipt.
8 Ndi Kaldea gābiaghachi kwa, buso obodo a agha; ha gēwere kwa ya, sure ya n'ọku.