2 Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu.
3 Otú a ka Jehova siri, Aghaghi inye obodo a n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ọ gēwere kwa ya.
4 Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.
5 Eze, bú Zedekaia, we si, Le, onye ahu di n'aka-unu: n'ihi na eze abughi onye puru ime ihe ọ bula megide unu.
6 Ha we were Jeremaia, tubà ya n'olùlù Malkija nwa eze, nke di n'ogige ulo-nche: ha we chiri udọ̀ rada Jeremaia. Ma miri adighi n'olùlù ahu, ọ bu nání apiti: Jeremaia we mibe n'apiti ahu.
7 Ebed-melek, bú onye Etiopia, onye bu onozi, nke nọ n'ulo eze, we nuru na ha tiyereri Jeremaia n'olùlù; ma eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Benjamin;
8 Ebed-melek we si n'ulo eze puta, gwa eze okwu, si,