Jeremaia 40:5-11 IGBOB

5 Ma mb͕e ọ kālaghachighi, ọ si ya, Ma-ọbu laghachikuru Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye eze Babilon meworo onye-nlekọta obodo nile nke Juda, gi na ya biri n'etiti ndi-gi: ma-ọbu je ebe ọ bula ziri ezi n'anya-gi ije. Onye-isi ndi-ob͕ū we nye ya òkè ihe-oriri na onyinye, zilaga ya.

6 Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n'etiti ndi Israel ndi fọduru n'ala-ha.

7 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n'ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n'ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon;

8 ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.

9 Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si, Unu atula egwu ifè ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon, ọ gādi-kwa-ra unu nma.

10 Ma mu onwem, le, m'ganēbi na Mizpa, iguzo n'iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n'ihe-unu, biri-kwa-nu n'obodo nile unu nke unu wereworo.

11 Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n'etiti umu Amon, na n'Edom, na ndi nọ n'ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;